3 Ụmụ ndị amụma+ ndị nọ na Betel pụtara bịakwute Ịlaịsha wee sị ya: “Ị̀ makwa na ọ bụ taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ O wee zaa, sị: “Mụ onwe m kwa maara nke ọma.+ Gbanụ nkịtị.”
14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma, abụghịkwa m nwa onye amụma;+ kama abụ m onye na-azụ anụ+ nakwa onye na-arụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ.