26 N’elu mbara igwe ahụ nke dị n’elu isi ha, e nwere ihe yiri nkume safaya,+ ihe yiri ocheeze.+ N’elu ihe ahụ yiri ocheeze, e nwere onye yiri mmadụ nke nọkwasịrị ya,+ n’elu.
9 “Anọ m na-ele anya ruo mgbe e debegasịrị ocheeze,+ Onye Ochie ahụ+ wee nọdụ ọdụ. Uwe ya na-acha ezigbo ọcha,+ ntutu dị ya n’isi dị ka owú dị ọcha.+ Ocheeze ya bụ ire ọkụ ire ọkụ;+ ụkwụ ya bụ ọkụ na-ere ere.+