6 ma ụmụ ndị iko Ebreham mụụrụ ya, Ebreham nyere ha onyinye.+ O wee zipụ ha, mgbe ya onwe ya ka nọ ndụ, ka ha pụọ n’ebe Aịzik nọ+ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ala Ebe Ọwụwa Anyanwụ.+
3 Anụ ụlọ+ ya dị puku atụrụ asaa na puku kamel atọ na otu puku ehi e jikọrọ abụọ abụọ nakwa narị nne ịnyịnya ibu ise, tinyere ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi; nwoke ahụ wee bụrụ onye kasị baa ọgaranya ná ndị Ọwụwa Anyanwụ niile.+