22 Jehova ga-eme ka ị rịawa ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ na ọrịa ahụ́ ọzịza na oké okpomọkụ, meekwa ka mma agha+ bịakwasị gị, meekwa ka ihe ọkụkụ gị kpọnwụọ,+ meekwa ka ihe ọkụkụ gị maa ebù,+ ihe ndị a ga-achụkwa gị ọsọ ruo mgbe ị lara n’iyi.
9 “‘Emere m ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ, meekwa ka ihe unu kụrụ maa ebu.+ Unu mere ka ubi vaịn unu na ubi unu ndị ọzọ dị ọtụtụ, ma egú ripịara osisi fig unu na osisi oliv unu;+ ma unu alọghachikwuteghị m,’+ ka Jehova kwuru.