22 Jehova ga-eme ka ị rịawa ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ na ọrịa ahụ́ ọzịza na oké okpomọkụ, meekwa ka mma agha+ bịakwasị gị, meekwa ka ihe ọkụkụ gị kpọnwụọ,+ meekwa ka ihe ọkụkụ gị maa ebù,+ ihe ndị a ga-achụkwa gị ọsọ ruo mgbe ị lara n’iyi.
37 “Ọ bụrụ na ụnwụ+ adaa n’ala a, ọ bụrụ na e nwee ọrịa na-efe efe,+ ọ bụrụ na ihe ọkụkụ akpọnwụọ, e nweekwa ịma ebu,+ igurube+ na ọchịcha;+ ọ bụrụ na ndị iro ha anọchibido ha n’ọnụ ụzọ ámá nke ala ha, ụdị ihe otiti ọ bụla, ụdị ọrịa ọ bụla,
17 emere m ka okpomọkụ+ na ịma ebu+ na akụ́ mmiri ígwé+ bịakwasị unu, bịakwasịkwa ọbụna ọrụ aka unu niile,+ ọ dịghịkwa onye unu na ya nọ nke na-echigharịkwute m,’+ ka Jehova kwuru—