28 “Ọ bụrụ na ụnwụ+ adaa n’ala a, ọ bụrụ na e nwee ọrịa na-efe efe,+ ọ bụrụ na ihe ọkụkụ akpọnwụọ,+ e nweekwa ịma ebu,+ igurube+ na ọchịcha;+ ọ bụrụ na ndị iro+ ha anọchibido ha n’ọnụ ụzọ ámá+ nke ala ha—ụdị ihe otiti ọ bụla, ụdị ọrịa ọ bụla+—
9 “‘Emere m ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ, meekwa ka ihe unu kụrụ maa ebu.+ Unu mere ka ubi vaịn unu na ubi unu ndị ọzọ dị ọtụtụ, ma egú ripịara osisi fig unu na osisi oliv unu;+ ma unu alọghachikwuteghị m,’+ ka Jehova kwuru.
17 emere m ka okpomọkụ+ na ịma ebu+ na akụ́ mmiri ígwé+ bịakwasị unu, bịakwasịkwa ọbụna ọrụ aka unu niile,+ ọ dịghịkwa onye unu na ya nọ nke na-echigharịkwute m,’+ ka Jehova kwuru—