13 Jehova wee sị: “Ebe ọ bụ na ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto,+ ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ,+ egwu ha na-atụ m bụkwa ihe mmadụ nyere n’iwu nke a na-akụziri ha,+
3 Jehova, ọ́ bụghị ikwesị ntụkwasị obi ka anya gị na-achọ ịhụ?+ I tiwo ha ihe,+ ma ha adaghị ọrịa.+ I kpochapụrụ ha.+ Ha jụrụ ịnara ịdọ aka ná ntị.+ Ha mere ka ihu ha sie ike karịa nkume dị elu.+ Ha jụrụ ịlọghachi.+
6 “‘Mụ onwe m kwa mere ka ezé unu na-acha ọcha+ n’obodo unu niile, meekwa ka ụkọ ihe oriri dị n’obodo niile unu bi;+ ma unu alọghachikwuteghị m,’+ ka Jehova kwuru.