48 Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+
22 “Ọgbọ nke dị n’ihu, bụ́ ụmụ unu ndị ga-anọchi unu, na onye mba ọzọ nke ga-esi n’ala dị anya bịa, ga-asị, mgbe ha hụrụ ihe otiti nke ala ahụ na nrịanrịa ya ndị Jehova ji sogbuo ya,+
12 E mesịa, Jehoyakin eze Juda nyefere onwe ya n’aka eze Babịlọn,+ ya na nne ya+ na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị na-eje ozi n’obí ya; eze Babịlọn wee kpụrụ ya laa n’afọ nke asatọ+ nke ọchịchị ya.
11 N’ikpeazụ, Jehova mere ka ndị isi agha nke eze Asiria+ buso ha agha.+ Ha wee nwụde Manase n’ọgba+ wee tụọ ya ịgà+ abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.