63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
17 Ka onye nke ahụ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịara wee sị: “Ndị Kaldia+ kere onwe ha ụzọ atọ wee wakpo kamel gị ma chịrị ha, ha jikwa ihu mma agha gbuo ndị na-elekọta ha; m wee gbapụ, naanị m, ka m kọọrọ gị ihe merenụ.”
6 N’ihi na, lee, m ga-eme ka ndị Kaldia bilie,+ bụ́ mba nwere obi ilu nke na-emekwa ihe ọsọ ọsọ, nke na-aga n’ebe ndị sara mbara n’ụwa iji weghara ebe obibi ndị na-abụghị nke ya.+