3 Ụmụ ndị amụma+ ndị nọ na Betel pụtara bịakwute Ịlaịsha wee sị ya: “Ị̀ makwa na ọ bụ taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ O wee zaa, sị: “Mụ onwe m kwa maara nke ọma.+ Gbanụ nkịtị.”
5 Ụmụ ndị amụma ndị nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaịsha wee sị ya: Ị̀ makwa na ọ bụ taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?” O wee zaa sị: “Mụ onwe m kwa maara nke ọma. Gbanụ nkịtị.”+