18 Jehoyada nyefekwara ọrụ ndị dị n’ụlọ Jehova n’aka ndị nchụàjà na ndị Livaị, bụ́ ndị Devid+ kere n’ìgwè n’ìgwè ilekọta ụlọ Jehova ka ha wee na-achụ àjà nsure ọkụ Jehova dị ka ihe e dere n’iwu Mozis si dị,+ jirikwa ịṅụrị ọṅụ na abụ na-eme nke ahụ dị ka ntụziaka Devid si dị.