28 Elayab+ bụ́ ọkpara nne ya wee nụ ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu, Elayab wee weso Devid iwe+ dị ọkụ, nke mere na ọ sịrị: “Gịnị mere i ji bịa? Ọ̀ bụkwa onye ka ị hapụụrụ atụrụ ole na ole ahụ n’ala ịkpa?+ Mụ onwe m maara na ị dị mpako, nweekwa obi ọjọọ,+ n’ihi na ihe mere i ji bịa bụ ka ị hụ agha a.”+