39 Taa, adịghị m ike, ọ bụ ezie na e tere m mmanụ+ ịbụ eze, obi ọjọọ ndị ikom a, bụ́ ụmụ Zeruya,+ karịrị m.+ Ka Jehova kwụọ onye na-eme ihe ọjọọ ụgwọ dị ka ihe ọjọọ ya si dị.”+
10 Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka; o wee were ya maa+ ya n’afọ, eriri afọ ya wee wụpụtasịa n’ala, ya ahapụzie ịma ya ọzọ. O wee nwụọ. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke wee chụrụ Shiba nwa Bikraị gawa.
6 Devid wee sị: “Onye ọ bụla nke ga-ebu ụzọ buso ndị Jibọs agha+ ga-abụ onye ndú na onyeisi.” Joab+ nwa Zeruya wee buru ụzọ gbagoo, o wee ghọọ onyeisi.