2 O wee gakwuru Esa sị ya: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya;+ ọ bụrụ na unu achọọ+ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.+
6 Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị,+ ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma,+ n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị,+ na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike+ ụgwọ ọrụ.+