2 O wee gakwuru Esa sị ya: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya;+ ọ bụrụ na unu achọọ+ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.+
22 N’ihi na ihere mere m ịrịọ eze ka o nye anyị ndị agha+ na ndị na-agba ịnyịnya+ iji nyere anyị aka ibuso ndị iro agha n’ụzọ, n’ihi na anyị gwara eze, sị: “Aka+ Chineke anyị na-echebe ndị niile na-achọ ya imere ha ihe ọma,+ ma ike ya na iwe+ ya na-emegide ndị niile na-ahapụ ya.”+