9 N’ihi na anya+ Jehova na-ahụzu ụwa dum+ iji gosi ike ya maka ndị obi ha+ zuru ezu n’ebe ọ nọ. I zuzuru nzuzu+ n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”+
6 ọ bụ Ezra nke a si na Babịlọn lawa; ọ bụkwa ọkà n’idepụta ihe+ dị n’iwu Mozis,+ nke Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere, nke mere ka eze nye ya ihe niile ọ rịọrọ, dị ka aka Jehova bụ́ Chineke ya nke dị n’ahụ́ ya si dị.+
28 O gosiwokwa m obiọma*+ n’ihu eze na ndị ndụmọdụ ya+ nakwa n’ihu ndị isi niile nke eze bụ́ ndị dike. Emekwara m onwe m ka m dị ike n’ihi aka+ Jehova bụ́ Chineke m nke dị n’ahụ́ m, m wee si n’Izrel họpụta ndị isi ka ha soro m laa.
6 O wee sị m: “Nke a bụ ihe Jehova gwara Zerọbabel, ‘“Ọ bụghị site n’ụsụụ ndị agha,+ ọ bụghịkwa site n’ike,+ kama ọ bụ site na mmụọ m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.