9 N’ihi na anyị bụ ndị ohu;+ Chineke anyị ahapụghịkwa anyị n’agbụ anyị nọ na ya,+ kama o gosiri anyị obiọma* n’ihu ndị eze Peshia,+ mee ka anyị nweta ume ka anyị wee wuo ụlọ Chineke anyị,+ wughachikwa ebe+ ya ndị tọgbọrọ n’efu, nyekwa anyị mgbidi e ji nkume wuo+ na Juda nakwa na Jeruselem.
11 Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị na ekpere+ ndị ohu gị, bụ́ ndị ịtụ egwu aha gị+ na-atọ ụtọ; biko, mee ka ohu gị nwee ihe ịga nke ọma taa,+ meekwa ka ọ bụrụ onye nwoke a ga-emere ebere.”+