4 Ya mere, m ga-ekwe n’ezie ka obi Fero kpọchie,+ ọ ga-achụwakwa ha, m ga-enwetara onwe m otuto site n’imeri Fero na ìgwè ndị agha ya niile;+ ndị Ijipt ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova.”+ Ha wee mee nnọọ otú ahụ.
17 Onye na-ewepụta ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya, na-akpọpụtakwa ndị agha na ndị dị ike n’otu mgbe ahụ:+ “Ha ga-edina ala.+ Ha agaghị ebili.+ A ga-emenyụ ha dị ka ọkụ.+ A ga-afụnyụ ha dị ka ọkụ a mụnyere n’owu oriọna.”+