15 Ị ga-etekwa ha mmanụ dị ka i tere nna ha mmanụ,+ ha ga-abụ ndị nchụàjà m, mmanụ ị ga-ete ha ga-eme ka ha na-eje ozi dị ka ndị nchụàjà ruo mgbe a na-akaghị aka n’ọgbọ ha niile.”+
15 E mesịakwa, ndị Livaị ga-abata jewe ozi n’ụlọikwuu nzute.+ N’ihi ya, mee ka ha dị ọcha, meekwa ka ha gaa ihu na azụ dị ka àjà a na-efegharị efegharị.+
2 Kpọrọkwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ọnụmara nna gị, bịa nso, ka ha sonyere gị wee na-ejere gị ozi,+ na-ejere ma gị onwe gị ma ụmụ gị ozi, n’ihu ụlọikwuu Ihe Àmà.+
5 “Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị ga-abịarukwa nso, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke gị họọrọ ka ha na-ejere ya ozi+ nakwa ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ,+ ọ bụkwa ọnụ ha ga-ekpe ikpe esemokwu ọ bụla metụtara ime ihe ike ọ bụla.+