9 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Lee! M ga-abịakwute gị n’oké ígwé ojii,+ ka ụmụ Izrel wee nụ mgbe m ga-agwa gị okwu,+ ka ha wee nweekwa okwukwe n’ebe ị nọ ruo mgbe a na-akaghị aka.”+ Mozis wee gwa ụmụ Izrel ihe Jehova kwuru.
6 Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị,+ ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma,+ n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị,+ na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike+ ụgwọ ọrụ.+