3 Eze Izrel wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Ùnu maara n’ezie na ọ bụ anyị nwe Remọt-gilied?+ Ma o nweghị ihe anyị na-eme ịnapụta ya n’aka eze Siria.”
14 O wee bịakwute eze, eze wee sị ya: “Mịkaya, ọ̀ bụ anyị gaa Remọt-gilied buo agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?” Ozugbo ahụ, ọ sịrị: “Gbagoo nwee ihe ịga nke ọma; a ga-enyefe ha n’aka unu.”+