19 Adị m ka nwa ebule dị nwayọọ, nke a kpụtara n’ebe a ga-egbu ya,+ amaghị m na ọ bụ m ka ha mere atụmatụ imegide, sị:+ “Ka anyị laa osisi a na mkpụrụ ya n’iyi, ka anyị gbupụ ya n’ala ndị dị ndụ,+ ka a ghara icheta aha ya ọzọ.”
18 Ha wee sị: “Bịanụ ka anyị chepụta ihe anyị ga-eme Jeremaya,+ n’ihi na iwu agaghị akọ ụkọ n’ọnụ ndị nchụàjà,+ ndụmọdụ agaghị akọ ụkọ n’ọnụ onye maara ihe, okwu agaghịkwa akọ ụkọ n’ọnụ onye amụma.+ Bịanụ ka anyị were ire anyị mee ya ihe,+ ka anyị gharakwa ịṅa ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.”