9 Ha wee kpọsaa n’ime Juda na Jeruselem dum ka a na-ewetara Jehova ụtụ dị nsọ+ bụ́ nke Mozis ohu ezi Chineke nyere Izrel iwu+ n’ala ịkpa ka ha na-eweta.
22 N’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia,+ ka ihe Jehova kwuru+ site n’ọnụ Jeremaya+ wee mezuo, Jehova kpaliri mmụọ+ Saịrọs eze Peshia. O wee mee ka a kpọsaa n’alaeze ya dum, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị: