2 Ndị Eze 20:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 “Laghachi, gwa Hezekaya bụ́ onye ndú+ nke ndị m, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke+ Devid bụ́ nna nna gị kwuru: “Anụwo m+ ekpere gị.+ Ahụwo m anya mmiri gị.+ Lee, m ga-agwọ gị.+ N’ụbọchị nke atọ, ị ga-agbago n’ụlọ Jehova.+ Abụ Ọma 66:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 N’ezie, Chineke anụwo;+Ọ ṅawokwa ntị n’ekpere m.+ Luk 1:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Otú ọ dị, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Zekaraya, atụla egwu, n’ihi na a nụwo arịrịọ ị na-arịọsi ike,+ nwunye gị bụ́ Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.+ Ọrụ Ndịozi 10:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 wee sị: ‘Kọnịliọs, a nụwo ekpere gị, e chetawokwa onyinye ebere gị n’ihu Chineke.+ 1 Pita 3:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 N’ihi na anya+ Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike;+ ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”+
5 “Laghachi, gwa Hezekaya bụ́ onye ndú+ nke ndị m, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke+ Devid bụ́ nna nna gị kwuru: “Anụwo m+ ekpere gị.+ Ahụwo m anya mmiri gị.+ Lee, m ga-agwọ gị.+ N’ụbọchị nke atọ, ị ga-agbago n’ụlọ Jehova.+
13 Otú ọ dị, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Zekaraya, atụla egwu, n’ihi na a nụwo arịrịọ ị na-arịọsi ike,+ nwunye gị bụ́ Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.+
12 N’ihi na anya+ Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike;+ ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”+