31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ndọba oriọna. Ị ga-akpụ ihe ndọba oriọna ahụ akpụ.+ Ụkwụ ya, alaka ya, iko ya, isi ya nakwa ifuru ya ga-esi n’ahụ́ ya pụta.
20 “Ma gị onwe gị, ị ga-enye ụmụ Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ a na-agwaghị agwa, nke a sụpụtara ná mkpụrụ oliv maka ihe ọkụ, ka e jiri ya na-amụnye oriọna mgbe niile.+