17 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ndọba oriọna.+ Ọ kpụrụ ihe ndọba oriọna ahụ akpụ. Akụkụ ya na alaka ya, iko ya, isi ya nakwa ifuru ya si n’ahụ́ ya pụta.+
20 na ihe ndọba oriọna+ na oriọna+ ha ndị e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee, iji na-amụnye ha ọkụ n’ihu ọnụ ụlọ dị n’ime ime,+ dị ka ụkpụrụ e nyere si dị;
M wee sị ya: “Ahụrụ m, ma, lee! e nwere ihe ndọba oriọna nke bụ́ ọlaedo ọlaedo,+ otu ọkwá dịkwa n’elu ya. Oriọna ya asaa dịkwa n’elu ya, ee, ha dị asaa;+ oriọna ndị dị n’elu ya nwekwara okporo asaa.