6 Ndị a bụ ndị si n’ógbè a na-achị achị,+ bụ́ ndị si n’etiti ndị a dọọrọ n’agha lọta,+ ndị Nebukadneza+ eze Babịlọn dọọrọ n’agha,+ ndị mesịkwara lọta Jeruselem na Juda, onye nke ọ bụla n’obodo nke ya;+
7 Ọ ga-aghọkwa ógbè nke ndị fọdụrụ n’ụlọ Juda.+ Ha ga-atakwa nri na ya. Ha ga-edina n’ụlọ ndị dị n’Ashkelọn ná mgbede wee tụsara ahụ́. N’ihi na Jehova Chineke ha ga-eche ihu ya n’ebe ha nọ+ wee chịkọtaghachi ndị a dọọrọ n’agha n’ime ha.”+