18 Ya mere, lezienụ anya otú unu si aṅa ntị, n’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya,+ ma onye ọ bụla nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o chere na ya nwere.”+
14 Otu nwaanyị aha ya bụ Lidia, onye na-ere ákwà na-acha odo odo, onye obodo Tayataịra,+ onye na-efekwa Chineke, nọkwa na-ege ntị. Jehova wee meghee nnọọ obi+ ya ịnabata ihe Pọl nọ na-ekwu.
11 Ndị Beria nwere ezi obi karịa ndị bi na Tesalonaịka, n’ihi na ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha+ Akwụkwọ Nsọ+ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.+