3 N’ógbè niile dị iche iche,+ n’ebe ọ bụla okwu eze na iwu ya ruru, e nwere oké iru uju+ n’etiti ndị Juu, nakwa ibu ọnụ+ na ịkwa ákwà na mkpu arịrị. A gbasakwara ákwà iru uju,+ kposakwa ntụ+ ka ọ bụụrụ ọtụtụ ndị ihe ndina.
5 Ndị Ninive wee malite inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ,+ ha wee kpọsaa ibu ọnụ nakwa ka e yiri ákwà iru uju,+ malite n’onye kasị ukwuu n’ime ha ọbụna ruo n’onye kasị nta n’ime ha.