9 “‘Otú ọ dị, n’ụbọchị izu ike,+ ihe a ga-eji chụọ àjà bụ ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, tinyere ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka a gwara mmanụ, ya na àjà ihe ọṅụṅụ ya,
11 Onye nchụàjà ọ bụla na-eguzo+ kwa ụbọchị+ ijere ọha mmadụ ozi na ịchụ otu àjà ndị ahụ mgbe mgbe, ebe ọ na-adịghị mgbe àjà ndị a nwere ike iwepụ mmehie kpamkpam.+