29 Matanụ na Jehova enyewo unu ụbọchị izu ike.+ Ọ bụ ya mere o ji na-enye unu ihe oriri unu ga-eri ụbọchị abụọ n’ụbọchị nke isii. Onye ọ bụla nọrọ n’ụlọ ya.+ Ka onye ọ bụla ghara isi n’ebe o bi pụọ n’ụbọchị nke asaa.”
10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla, gị onwe gị ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị, ohu gị nwoke ma ọ bụ ohu gị nwaanyị ma ọ bụ anụ ụlọ gị ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi n’obodo gị.+