9 Ọ ga-abụrụ gị ihe ịrịba ama n’aka gị nakwa ihe ncheta n’agbata anya gị abụọ,+ ka iwu Jehova wee dịrị n’ọnụ gị;+ n’ihi na Jehova ji aka dị ike kpọpụta gị n’Ijipt.+
13 “Ma gị onwe gị, gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Unu ga-edebe ụbọchị izu ike m karịsịa,+ n’ihi na ọ bụ ihe ịrịba ama n’etiti mụ na unu n’ọgbọ niile unu ka unu wee mara na mụ onwe m bụ Jehova onye na-edo unu nsọ.+
2 Ụbọchị isii ka a pụrụ ịrụ ọrụ,+ ma ụbọchị nke asaa ga-abụrụ unu ihe dị nsọ, ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya nye Jehova. Onye ọ bụla rụrụ ọrụ na ya, a ga-egbu ya.+