13 E nyere ndị na-ebu ozi+ akwụkwọ ozi ahụ, ha wee wegara ya ógbè niile eze na-achị, ka ha bibie, gbuo ma laa ndị Juu niile n’iyi, ma nwa okorobịa ma agadi, ma ụmụntakịrị ma ndị inyom, n’otu ụbọchị,+ n’abalị iri na atọ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, ọnwa Eda,+ ka a kwakọrọkwa ihe ha.+