8 N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha,+ karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya,+ ọ jụwo+ okwukwe anyị,+ jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.
27 Ụdị ofufe nke dị ọcha,+ nke a na-emerụghịkwa emerụ+ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei+ na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ+ ná mkpagbu ha,+ na mmadụ idebe onwe ya ka ọ ghara inwe ntụpọ+ site n’ụwa.+