7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+
4 M wee nụ ka olu ọzọ nke si n’eluigwe na-asị: “Ndị nke m,+ sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya,+ ma ọ bụrụkwa na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.