4 Ònye rịgoworo n’eluigwe, ka o wee rịdata?+ Ònye jiworo ọbụ aka ya abụọ kpokọta ifufe?+ Ònye jiworo ákwà mgbokwasị kechie mmiri?+ Ònye meworo ka nsọtụ niile nke ụwa dịrị?+ Gịnị bụ aha ya,+ gịnịkwa bụ aha ọkpara ya, ma ọ bụrụ na ị maara?+
3 Ọ bụrụ na mmiri erujuo n’ígwé, ọ na-asụ asụ n’elu ala;+ ọ bụrụkwa na osisi adaa n’ebe ndịda ma ọ bụ n’ebe ugwu, n’ebe ahụ osisi ahụ+ dara ka ọ ga-atọgbọrọ.