25“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esee okwu,+ ha ewee bịa ka e kpeere ha ikpe,+ a ga-ekpere ha ikpe ma kwuo na onye ezi omume bụ onye ezi omume, kwuokwa na onye ajọ omume bụ onye ajọ omume.+
15 Onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ajọ omume bụ onye ezi omume+ nakwa onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ezi omume bụ onye ajọ omume+—ọbụna ha abụọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.+