3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya,+ ọ bụ onye nwere ihe mgbu, onye makwaara ihe bụ́ ọrịa.+ Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ.+ E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.+
29 ha wee jiri ogwu kpaa okpueze, kpuwe ya n’isi, nyekwa ya okporo ahịhịa amị n’aka nri ya. Ha gburu ikpere n’ala n’ihu ya, jiri ya mee ihe ọchị,+ sị: “Ndeewo, gị Eze ndị Juu!”+