2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+
21 Nke ka nke, ekwela ka ha mee ka i kwere, n’ihi na ihe karịrị ndị ikom iri anọ n’ime ha na-echechi ya,+ ha ejiriwokwa ịṅụ iyi jikọta onwe ha na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ruo mgbe ha gburu ya;+ ha dịkwa njikere ugbu a, na-echere ka i kwe ha nkwa.”