35 ‘Ka ihe ike e mere m, meekwa ahụ́ m, dịrị n’isi Babịlọn!’ ka nwaanyị bi na Zayọn ga-ekwu.+ ‘Ka ọbara m dịrị n’isi ndị bi na Kaldia!’ ka Jeruselem ga-ekwu.”+
19 Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ,+ kama nyenụ ọnụma ahụ ohere;+ n’ihi na e dere, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.”+
20 “Ṅụrịa ọṅụ, gị eluigwe,+ na unu ndị nsọ+ na unu ndịozi+ na unu ndị amụma n’ihi ihe mere ya, n’ihi na Chineke amawo ya ikpe ma nye ya ntaramahụhụ n’ihi unu!”+