23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
2 iji kwapụ ndị ogbenye n’okwu ikpe, napụkwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’etiti ndị m+ ikpe ziri ezi, ka ndị inyom di ha nwụrụ wee ghọọrọ ha ihe nkwata, ka ha wee bukọrọ ihe ụmụ na-enweghị nna!+