19 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke gbagọrọ+ ikpe+ nke onye mbịarambịa,+ nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
27 Ụdị ofufe nke dị ọcha,+ nke a na-emerụghịkwa emerụ+ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei+ na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ+ ná mkpagbu ha,+ na mmadụ idebe onwe ya ka ọ ghara inwe ntụpọ+ site n’ụwa.+