23 Ejiriwo m onwe m ṅụọ iyi+—okwu ahụ esiwokwa n’ọnụ m pụta n’ezi omume,+ ya mere, ọ gaghị alaghachi azụ+—na ikpere niile ga-egburu m n’ala.+ Ire niile ga-aṅụkwara m iyi,+
10 Jizọs wee sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe,+ ọ bụkwa naanị ya+ ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’”+
7 o ji oké olu na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke,+ nyekwa ya otuto,+ n’ihi na oge awa nke ikpe si n’aka ya eruwo,+ n’ihi ya, feenụ Onye ahụ nke kere+ eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri niile.”+
9 Ma ọ gwara m, sị: “Kpachara anya! Emela ya! Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị bụ́ ndị amụma,+ nakwa ohu ndị na-edebe okwu nke dị n’akwụkwọ mpịakọta a. Fee Chineke.”+