14 O wee zaa, sị: “Ee e, kama mụ onwe m bịara ugbu a dị ka ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova.”+ Jọshụa wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọ isiala+ wee sị ya: “Gịnị ka onyenwe m na-agwa ohu ya?”
35 O wee ruo n’abalị ahụ na mmụọ ozi Jehova gara gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise n’ebe ndị Asiria+ mara ụlọikwuu.+ Mgbe ndị mmadụ biliri n’isi ụtụtụ, lee, ha niile bụ ozu ozu.+