29 Chineke wee sị: “Lee, enyewo m unu ahịhịa ndụ niile na-amị mkpụrụ bụ́ ndị dị n’elu ala dum nakwa osisi ọ bụla nke na-amị mkpụrụ a na-akụ akụ.+ Ka ọ bụrụ ihe oriri unu.+
7 Dị ka ihe atụ, ala nke na-aṅụ mmiri ozuzo nke na-ezokwasị ya mgbe mgbe, nke na-epupụtakwa ihe ọkụkụ kwesịrị ekwesị maka ndị ọ bụ n’ihi ha ka e ji kọọ ya,+ na-enweta ngọzi si n’aka Chineke.