16 Mgbe ahụ, ị ga-alụtara ụmụ gị ndị ikom ụmụ ha ndị inyom,+ ụmụ ha ndị inyom na chi ha ga-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, ha ga-emekwa ka ụmụ gị ndị ikom na chi ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ.+
7 Ha agakwaghị na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu,+ bụ́ ndị ha na ha na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ àjà ha. Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka, ruo ọgbọ unu niile.”’
39 ‘Ọ ga-abụkwara unu ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda unu, unu ga-ahụ ya wee cheta ihe niile Jehova nyere n’iwu+ wee mee ha, unu esola obi unu na anya unu,+ bụ́ ihe unu na-eso wee na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ.+
30 “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ̀ bụ n’ụzọ nna nna unu hà ka unu na-emerụ onwe unu,+ ọ̀ bụkwa ihe arụ ha ka unu na ha na-akwa iko?+