10 Lọt wee lelie anya hụ Ógbè Jọdan+ dum ruo Zoa.+ Ọ hụrụ na ógbè ahụ dum bụ ebe mmiri na-ede nke ọma dị ka ubi Jehova,+ dị ka ala Ijipt, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra.
23 bụ́ sọlfọ na nnu+ na ọkụ,+ nke mere na a gaghị akụ ihe n’ala ya dum, ihe agaghịkwa epulite na ya, ahịhịa ndụ agaghịkwa epu na ya, dị ka mgbe a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,+ Adma+ na Zeboyim,+ bụ́ ndị Jehova ji iwe na ọnụma kwatuo;+