23 Ma Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ dụrụ n’ọdụ,+ o wee dokwasị ihe o ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu wee bilie laa n’ụlọ ya, n’obodo ya.+ O wee nye ezinụlọ ya iwu+ ma kwụgbuo+ onwe ya, o wee si otú a nwụọ.+ E wee lie+ ya n’ebe ili ozu nke nna nna ya hà.
17 Ọ bụrụkwa na unu na-akpọku Nna nke na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu+ dị ka ọrụ onye nke ọ bụla si dị, jirinụ egwu na-eme omume+ n’oge unu bi dị ka ndị ala ọzọ.+