6 M ga-eziga ya ka o buso mba dapụrụ n’ezi ofufe+ agha, m ga-enyekwa ya iwu ka o buso ndị m na-eweso iwe agha,+ ka ọ kwata ọtụtụ ihe, bukọrọkwa ọtụtụ ihe, meekwa ka ọ bụrụ ebe a ga na-azọtọ azọtọ dị ka ájá dị n’okporo ámá.+
5 Ha ga-adịkwa ka ndị dike+ bụ́ ndị na-azọ ụkwụ n’apịtị dị n’okporo ámá ka ha na-alụ agha.+ Ha ga-alụ agha, n’ihi na Jehova nọnyeere ha;+ ihere ga-emekwa ndị na-agba ịnyịnya.+