9 N’eziokwu, anyị chere n’ime onwe anyị na a mawo anyị ikpe ọnwụ. Ihe mere anyị ji chee otú a bụ ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi,+ kama ka anyị tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.+
37 A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa,+ a kwọbiri ha akwọbi, e ji mma agha gbuo ha,+ ha yi akpụkpọ atụrụ+ na akpụkpọ ewu na-agagharị, ka ha nọ n’ụkọ,+ ná mkpagbu,+ ka a na-emeso ha mmeso ọjọọ;+